2 Ndị Kọrint 11:19
2 Corinthians 11:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu were obi ụtọ na-anagide ndị na-enweghị uche, ebe unu onwe unu nwere uche.
2 Corinthians 11:19 in English
2 Corinthians 11:19 · Berean Standard Bible
For you gladly tolerate fools, since you are so wise.
Context
17Ma nʼihe m dabeere na-anya isi, adịghị m ekwu okwu dịka Onyenwe anyị ga-ekwu, maọbụ dịka onye na-enweghị uche. 18Ebe ọtụtụ mmadụ na-anya isi banyere ihe ha bụ nʼụzọ ụwa si eme. Mụ onwe m ga-anyakwa isi. 19Unu were obi ụtọ na-anagide ndị na-enweghị uche, ebe unu onwe unu nwere uche. 20Unu na-anagide ya ma ọ bụrụ na onye ọbụla eme unu ndị ohu ha, maọbụ jiri anya ike nakọrọ unu ihe unu nwere, maọbụ ghọgbuo unu, maọbụ bulie onwe ya elu dịka ha karịrị unu, maọbụ maa unu uraa nʼihu. 21Nʼezie, ọ bụ ihere m, ịnabata na anyị bụ ndị na-adịghị ike nʼezie nye nke a.
Ọ bụrụ na onye ọbụla anwaa anwaa nyaa isi nʼihe ọbụla (ana m ekwu dịka onye nʼenweghị uche), mụ onwe m ga-anyakwa isi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.