2 Ihe E Mere 9:5
2 Chronicles 9:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ sịrị eze, “Akụkọ niile m nọ nʼala nụ banyere ihe niile ị rụpụtara na amamihe gị bụ eziokwu.
2 Chronicles 9:5 in English
2 Chronicles 9:5 · Berean Standard Bible
She said to the king, “The report I heard in my own country about your words * and wisdom is true.
Context
3Mgbe eze nwanyị Sheba hụrụ amamihe Solomọn, ma hụkwa ụlọeze o wuru, 4na ihe oriri a na-adọkwasị nʼelu tebul ya, usoro ọnọdụ nke ndịisi ọchịchị ya, na ndị guzo na-ejere ya ozi nʼuwe ha yi, ndị na-ebu iko ihe ọṅụṅụ nʼuwe ha, na aja nsure ọkụ niile ọ na-achụ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Ọ dịkwaghị ihe ọzọ ọ maara ọ ga-eme, maọbụ kwuo. 5Ọ sịrị eze, “Akụkọ niile m nọ nʼala nụ banyere ihe niile ị rụpụtara na amamihe gị bụ eziokwu. 6Ma ekwenyeghị m ihe ha kwuru tutu ruo mgbe m bịara jiri anya m abụọ hụ ha. Nʼezie, ihe m nụrụ erughị ọkara nke ịdị ukwuu amamihe gị. Ị tụkwasịla ihe nʼakụkọ m nụrụ. 7Lee, ụdị ọṅụ ndị gị na-enwe. Lee, ụdị ọṅụ nke ndị ozi na-enwe, bụ ndị na-eguzo nʼihu gị mgbe niile na-anụ okwu amamihe gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.