2 Ihe E Mere 9:4
2 Chronicles 9:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
na ihe oriri a na-adọkwasị nʼelu tebul ya, usoro ọnọdụ nke ndịisi ọchịchị ya, na ndị guzo na-ejere ya ozi nʼuwe ha yi, ndị na-ebu iko ihe ọṅụṅụ nʼuwe ha, na aja nsure ọkụ niile ọ na-achụ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Ọ dịkwaghị ihe ọzọ ọ maara ọ ga-eme, maọbụ kwuo.
2 Chronicles 9:4 in English
2 Chronicles 9:4 · Berean Standard Bible
the food at his table, the seating of his servants, the service and attire of his attendants and cupbearers, and the burnt offerings he presented * at the house of the LORD, it took her breath away.
Context
2Solomọn zara ya ajụjụ ya niile. Ọ dịkwaghị ihe siiri ya ike ịkọwara ya. 3Mgbe eze nwanyị Sheba hụrụ amamihe Solomọn, ma hụkwa ụlọeze o wuru, 4na ihe oriri a na-adọkwasị nʼelu tebul ya, usoro ọnọdụ nke ndịisi ọchịchị ya, na ndị guzo na-ejere ya ozi nʼuwe ha yi, ndị na-ebu iko ihe ọṅụṅụ nʼuwe ha, na aja nsure ọkụ niile ọ na-achụ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Ọ dịkwaghị ihe ọzọ ọ maara ọ ga-eme, maọbụ kwuo. 5Ọ sịrị eze, “Akụkọ niile m nọ nʼala nụ banyere ihe niile ị rụpụtara na amamihe gị bụ eziokwu. 6Ma ekwenyeghị m ihe ha kwuru tutu ruo mgbe m bịara jiri anya m abụọ hụ ha. Nʼezie, ihe m nụrụ erughị ọkara nke ịdị ukwuu amamihe gị. Ị tụkwasịla ihe nʼakụkọ m nụrụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.