2 Ihe E Mere 7:4
2 Chronicles 7:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, eze na ndị a niile chụrụ aja dị iche iche nʼihu Onyenwe anyị.
2 Chronicles 7:4 in English
2 Chronicles 7:4 · Berean Standard Bible
Then the king and all the people offered sacrifices before the LORD.
Context
2Ndị nchụaja enweghị ike ịbanye nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị nʼihi ebube Onyenwe anyị nke jupụtara ụlọnsọ ahụ. 3Mgbe ọha ndị Izrel niile hụrụ ọkụ ahụ si nʼelu daa, hụkwa ebube Onyenwe anyị ka o guzo nʼelu ụlọnsọ ukwu ahụ, ha dara nʼala kpọọ isiala nye Onyenwe anyị, kelee ya ekele sị:
“Nʼihi na Ọ dị mma
ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.” 4Mgbe ahụ, eze na ndị a niile chụrụ aja dị iche iche nʼihu Onyenwe anyị. 5Eze Solomọn chụrụ aja ehi nke dị puku iri abụọ na abụọ, na ewu na atụrụ dị narị puku na iri abụọ. Ya mere, Eze na ndị ahụ niile si otu a doo ụlọnsọ Chineke nsọ. 6Ndị nchụaja guzo nʼihu ọrụ ha, ha na ndị Livayị. Ha jiri ngwa egwu Onyenwe anyị nke eze Devid mere maka ị na-eto Onyenwe anyị, bụkwa nke o ji mgbe o nyere ekele, na-asị, “Ịhụnanya ya na-adị ruo ebighị ebi.” Na ncherita ihu ndị Livayị, ndị nchụaja fụrụ opi ike ha mgbe ndị Izrel guzooro ọtọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.