2 Ihe E Mere 7:3
2 Chronicles 7:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ọha ndị Izrel niile hụrụ ọkụ ahụ si nʼelu daa, hụkwa ebube Onyenwe anyị ka o guzo nʼelu ụlọnsọ ukwu ahụ, ha dara nʼala kpọọ isiala nye Onyenwe anyị, kelee ya ekele sị: “Nʼihi na Ọ dị mma ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”
2 Chronicles 7:3 in English
2 Chronicles 7:3 · Berean Standard Bible
When all the Israelites saw the fire coming down and the glory of the LORD above the temple, they bowed down on the pavement with their faces to the ground, and they worshiped and gave thanks to the LORD: “For He is good; His loving devotion endures forever.”
Context
1Ngwangwa, mgbe Solomọn kpesịrị ekpere a, ọkụ sitere nʼeluigwe daa repịa aja nsure ọkụ ahụ na aja ahụ niile. Ebube Onyenwe anyị jupụtakwara nʼụlọnsọ ukwu ahụ, 2Ndị nchụaja enweghị ike ịbanye nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị nʼihi ebube Onyenwe anyị nke jupụtara ụlọnsọ ahụ. 3Mgbe ọha ndị Izrel niile hụrụ ọkụ ahụ si nʼelu daa, hụkwa ebube Onyenwe anyị ka o guzo nʼelu ụlọnsọ ukwu ahụ, ha dara nʼala kpọọ isiala nye Onyenwe anyị, kelee ya ekele sị:
“Nʼihi na Ọ dị mma
ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.” 4Mgbe ahụ, eze na ndị a niile chụrụ aja dị iche iche nʼihu Onyenwe anyị. 5Eze Solomọn chụrụ aja ehi nke dị puku iri abụọ na abụọ, na ewu na atụrụ dị narị puku na iri abụọ. Ya mere, Eze na ndị ahụ niile si otu a doo ụlọnsọ Chineke nsọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.