Native Bible

2 Chronicles 6:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ ọ sịrị, “Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel. Onye ji aka ya abụọ mezuo nkwa ahụ o ji ọnụ ya kwee nna m Devid. Nʼihi na o kwuru sị,

2 Chronicles 6:4 in English

2 Chronicles 6:4 · Berean Standard Bible

and said: “Blessed be the LORD, the God of Israel, who has fulfilled with His own hand what He spoke with His mouth to my father David, saying,

Context

2Ma ewuola m ụlọnsọ pụrụ iche, maa mma nye gị, ebe ị ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi!” 3Dịka ọgbakọ Izrel niile na-eguzo nʼebe ahụ, eze chigharịrị onwe ya chee ha ihu, gọzie ha. 4Mgbe ahụ ọ sịrị, “Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel. Onye ji aka ya abụọ mezuo nkwa ahụ o ji ọnụ ya kwee nna m Devid. Nʼihi na o kwuru sị, 5‘Site nʼụbọchị ahụ m si nʼala Ijipt kpọpụta ndị m, ahọpụtaghị m obodo ọbụla nʼebo ọbụla nke Izrel, ka e wuru m ụlọnsọ ka Aha m dịrị nʼebe ahụ, maọbụ họpụta onye ọbụla ka ọ bụrụ onyendu ndị m Izrel. 6Ma ugbu a, a họrọla m Jerusalem ka ọ bụrụ ebe Aha m ga-adị, ahọrọkwala m Devid ị bụ onye ga-achị ndị m Izrel.’

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.