Native Bible

2 Chronicles 35:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị ikwu Asaf ndị a, bụ ndị na-abụ abụ, nọkwa nʼọnọdụ ha nʼusoro dịka ihe Devid, na Asaf, na Heman, na Jedutun onye amụma eze nyere nʼiwu. Ndị na-eche nche nʼọnụ ụzọ ama ahapụghị ọnọdụ ha, nʼihi na ndị Livayị ibe ha doziri ihe debere ha.

2 Chronicles 35:15 in English

2 Chronicles 35:15 · Berean Standard Bible

The singers, the descendants of Asaph, were at their stations according to the command of David, Asaph, Heman, and Jeduthun the king’s seer. And the gatekeepers at each gate did not need to leave their position, because their fellow Levites made preparations for them.

Context

13Otu a kwa, dịka e dere ya nʼiwu Mosis, ha hụrụ anụ aja ngabiga ahụ nʼọkụ, sie aja ndị dị nsọ nʼite, buputa ha ngwangwa kee ha ndị mmadụ niile. 14Emesịa, ha kwadooro onwe ha ihe, ma kwadokwara ndị nchụaja, nʼihi na ndị nchụaja, bụ ụmụ Erọn, nọọrị na-achụ aja nsure ọkụ na abụba anụ ruo abalị. Ya mere, ndị Livayị ji kwadoro onwe ha ma kwadokwara ndị nchụaja, bụ ụmụ Erọn ihe. 15Ndị ikwu Asaf ndị a, bụ ndị na-abụ abụ, nọkwa nʼọnọdụ ha nʼusoro dịka ihe Devid, na Asaf, na Heman, na Jedutun onye amụma eze nyere nʼiwu. Ndị na-eche nche nʼọnụ ụzọ ama ahapụghị ọnọdụ ha, nʼihi na ndị Livayị ibe ha doziri ihe debere ha. 16Ya mere, e doziri ofufe niile nke Onyenwe anyị nʼotu ụbọchị ahụ, maka ime Mmemme Ngabiga na ịchụ aja nsure ọkụ niile nʼebe ịchụ aja Onyenwe anyị, dịka eze Josaya nyere nʼiwu. 17Ndị Izrel bụ ndị nọ nʼebe ahụ mere Mmemme Ngabiga nʼoge ahụ, meekwa mmemme achịcha ekoghị eko ụbọchị asaa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.