2 Ihe E Mere 35:14
2 Chronicles 35:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Emesịa, ha kwadooro onwe ha ihe, ma kwadokwara ndị nchụaja, nʼihi na ndị nchụaja, bụ ụmụ Erọn, nọọrị na-achụ aja nsure ọkụ na abụba anụ ruo abalị. Ya mere, ndị Livayị ji kwadoro onwe ha ma kwadokwara ndị nchụaja, bụ ụmụ Erọn ihe.
2 Chronicles 35:14 in English
2 Chronicles 35:14 · Berean Standard Bible
Afterward, they made preparations for themselves and for the priests, since the priests, the descendants of Aaron, were offering up burnt offerings and fat until nightfall. So the Levites made preparations for themselves and for the priests, the descendants of Aaron.
Context
12Ha kenyere ezinaụlọ ọbụla anụ ndị ahụ niile ka ha jiri nke ha ketara chụọ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị nʼusoro dịka e dere nʼime akwụkwọ Mosis. Otu a ka ha mekwara banyere ehi ndị ahụ. 13Otu a kwa, dịka e dere ya nʼiwu Mosis, ha hụrụ anụ aja ngabiga ahụ nʼọkụ, sie aja ndị dị nsọ nʼite, buputa ha ngwangwa kee ha ndị mmadụ niile. 14Emesịa, ha kwadooro onwe ha ihe, ma kwadokwara ndị nchụaja, nʼihi na ndị nchụaja, bụ ụmụ Erọn, nọọrị na-achụ aja nsure ọkụ na abụba anụ ruo abalị. Ya mere, ndị Livayị ji kwadoro onwe ha ma kwadokwara ndị nchụaja, bụ ụmụ Erọn ihe. 15Ndị ikwu Asaf ndị a, bụ ndị na-abụ abụ, nọkwa nʼọnọdụ ha nʼusoro dịka ihe Devid, na Asaf, na Heman, na Jedutun onye amụma eze nyere nʼiwu. Ndị na-eche nche nʼọnụ ụzọ ama ahapụghị ọnọdụ ha, nʼihi na ndị Livayị ibe ha doziri ihe debere ha. 16Ya mere, e doziri ofufe niile nke Onyenwe anyị nʼotu ụbọchị ahụ, maka ime Mmemme Ngabiga na ịchụ aja nsure ọkụ niile nʼebe ịchụ aja Onyenwe anyị, dịka eze Josaya nyere nʼiwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.