2 Ihe E Mere 34:28
2 Chronicles 34:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ugbu a, aga m achịkọta gị nye nna nna gị ha, a ga-eli gị nʼudo. Anya gị agaghị ahụ mbibi nke m ga-eme ka ọ bịakwasị ebe a na ndị bi nʼime ya.’ ” Ha laghachiri inye eze ọsịsa ya.
2 Chronicles 34:28 in English
2 Chronicles 34:28 · Berean Standard Bible
‘Now I will indeed gather you to your fathers, and you will be gathered to your grave in peace. Your eyes will not see all the calamity that I will bring on this place and on its inhabitants.’” So they brought her answer back to the king.
Context
26Gwanụ eze Juda, onye ahụ zitere unu ịjụta ase site nʼọnụ Onyenwe anyị sị ya, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-ekwu banyere okwu ndị ahụ ị nụrụ. 27Nʼihi na o wutere gị nʼobi, na i wedakwara onwe gị nʼala nʼihu Chineke, mgbe ị nụrụ ihe o kwuru megide ebe a na ndị bi nʼime ya, nʼihi na i wedara onwe gị nʼala nʼihu m, ma dọwaakwa uwe gị, bekwaa akwa nʼihu m. Mụ onwe m anụla, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 28Ugbu a, aga m achịkọta gị nye nna nna gị ha, a ga-eli gị nʼudo. Anya gị agaghị ahụ mbibi nke m ga-eme ka ọ bịakwasị ebe a na ndị bi nʼime ya.’ ”
Ha laghachiri inye eze ọsịsa ya. 29Mgbe ahụ, eze kpọrọ ndị okenye Juda na Jerusalem niile. 30Ọ gara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ya na ndị ikom Juda niile, ndị niile bi na Jerusalem, na ndị nchụaja, na ndị Livayị, na ndị mmadụ niile, site nʼonye nta ruo na onye ukwu. Ọ gụpụtara na ntị onye ọbụla okwu niile si nʼakwụkwọ ọgbụgba ndụ ahụ, bụ nke achọtara nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.