2 Ihe E Mere 34:26
2 Chronicles 34:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gwanụ eze Juda, onye ahụ zitere unu ịjụta ase site nʼọnụ Onyenwe anyị sị ya, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-ekwu banyere okwu ndị ahụ ị nụrụ.
2 Chronicles 34:26 in English
2 Chronicles 34:26 · Berean Standard Bible
But as for the king of Judah, who sent you to inquire of the LORD, tell him that this is what the LORD, the God of Israel, says: ‘As for the words that you heard,
Context
24‘Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu: Ana m aga iweta mbibi ga-adakwasị ebe a na ndị niile bi nʼime ya, ọbụbụ ọnụ niile e dere nʼime akwụkwọ a, bụ nke a gụpụtara nʼihu eze Juda. 25Nʼihi na ha ajụla m, gbakụta m azụ, chụọ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ, kpasuo m iwe site na ihe niile nke aka ha mepụtara, a ga-awụkwasị iwe m nʼebe a, ọ gaghị akwụsịkwa.’ 26Gwanụ eze Juda, onye ahụ zitere unu ịjụta ase site nʼọnụ Onyenwe anyị sị ya, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-ekwu banyere okwu ndị ahụ ị nụrụ. 27Nʼihi na o wutere gị nʼobi, na i wedakwara onwe gị nʼala nʼihu Chineke, mgbe ị nụrụ ihe o kwuru megide ebe a na ndị bi nʼime ya, nʼihi na i wedara onwe gị nʼala nʼihu m, ma dọwaakwa uwe gị, bekwaa akwa nʼihu m. Mụ onwe m anụla, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 28Ugbu a, aga m achịkọta gị nye nna nna gị ha, a ga-eli gị nʼudo. Anya gị agaghị ahụ mbibi nke m ga-eme ka ọ bịakwasị ebe a na ndị bi nʼime ya.’ ”
Ha laghachiri inye eze ọsịsa ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.