Native Bible

2 Chronicles 34:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ gara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ya na ndị ikom Juda niile, ndị niile bi na Jerusalem, na ndị nchụaja, na ndị Livayị, na ndị mmadụ niile, site nʼonye nta ruo na onye ukwu. Ọ gụpụtara na ntị onye ọbụla okwu niile si nʼakwụkwọ ọgbụgba ndụ ahụ, bụ nke achọtara nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị.

2 Chronicles 34:30 in English

2 Chronicles 34:30 · Berean Standard Bible

And he went up to the house of the LORD with all the people of Judah and Jerusalem, as well as the priests and the Levites—all the people small and great—and in their hearing he read all the words of the Book of the Covenant that had been found in the house of the LORD.

Context

28Ugbu a, aga m achịkọta gị nye nna nna gị ha, a ga-eli gị nʼudo. Anya gị agaghị ahụ mbibi nke m ga-eme ka ọ bịakwasị ebe a na ndị bi nʼime ya.’ ” Ha laghachiri inye eze ọsịsa ya. 29Mgbe ahụ, eze kpọrọ ndị okenye Juda na Jerusalem niile. 30Ọ gara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ya na ndị ikom Juda niile, ndị niile bi na Jerusalem, na ndị nchụaja, na ndị Livayị, na ndị mmadụ niile, site nʼonye nta ruo na onye ukwu. Ọ gụpụtara na ntị onye ọbụla okwu niile si nʼakwụkwọ ọgbụgba ndụ ahụ, bụ nke achọtara nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị. 31Eze guzoro nʼakụkụ ogidi, kwee nkwa nʼihu Onyenwe anyị, ịgbaso Onyenwe anyị, na idebe iwu ya na ụkpụrụ ya niile, na iji obi ya niile, na mkpụrụobi ya niile rube isi nʼokwu ọgbụgba ndụ ahụ e dere nʼakwụkwọ ahụ. 32O mekwara ka ndị niile nọ na Jerusalem na Benjamin kwee Onyenwe anyị otu nkwa ahụ. Ndị niile bi na Jerusalem mezukwara ihe ndị a dịka ọgbụgba ndụ Chineke, bụ Chineke nna nna ha si dị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.