2 Ihe E Mere 34:14
2 Chronicles 34:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ha na-ewepụta ego anabatara nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, Hilkaya onye nchụaja chọtara akwụkwọ Iwu Onyenwe anyị, bụ nke o nyere site nʼaka Mosis.
2 Chronicles 34:14 in English
2 Chronicles 34:14 · Berean Standard Bible
While they were bringing out the money that had been taken into the house of the LORD, Hilkiah the priest found the Book of the Law of the LORD written by * Moses.
Context
12Ndị ọrụ a rụrụ ọrụ ha nʼikwesị ntụkwasị obi. Ndị nlekọta ha bụ ndị Livayị ndị a: Jahat na Ọbadaya ndị si nʼikwu Merari, na Zekaraya na Meshulam ndịisi nʼikwu Kohat. Ndị Livayị ndị ọzọ, ndị bụ ndị nwere nghọta nʼiti ngwa egwu dị iche iche 13ka e mere ndị nlekọta ndị na-ebu ibu. Ha lekọtakwara ndị niile rụrụ ọrụ dị iche iche. Ụfọdụ nʼime ndị Livayị ndị a bụ ndị ode akwụkwọ na ndị na-edekọ ihe, na ndị na-eche ọnụ ụzọ nche. 14Mgbe ha na-ewepụta ego anabatara nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, Hilkaya onye nchụaja chọtara akwụkwọ Iwu Onyenwe anyị, bụ nke o nyere site nʼaka Mosis. 15Hilkaya sịrị Shefan ode akwụkwọ, “Achọtala m Akwụkwọ Iwu nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.” O nyere ya Shefan. 16Mgbe ahụ, Shefan buuru akwụkwọ ahụ wegara ya eze, gwa ya sị, “Ndị ozi gị na-eje ozi ha dịka ihe niile i tinyere ha nʼaka si dị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.