Native Bible

2 Chronicles 34:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị ọrụ a rụrụ ọrụ ha nʼikwesị ntụkwasị obi. Ndị nlekọta ha bụ ndị Livayị ndị a: Jahat na Ọbadaya ndị si nʼikwu Merari, na Zekaraya na Meshulam ndịisi nʼikwu Kohat. Ndị Livayị ndị ọzọ, ndị bụ ndị nwere nghọta nʼiti ngwa egwu dị iche iche

2 Chronicles 34:12 in English

2 Chronicles 34:12 · Berean Standard Bible

And the men did the work faithfully. The Levites overseeing them were Jahath and Obadiah, descendants of Merari, and Zechariah and Meshullam, descendants of Kohath. Other Levites, all skilled with musical instruments,

Context

10Mgbe ahụ, ha nyefere ya nʼaka ndị ikom ahọpụtara maka ilekọta ọrụ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Ndị ikom a kwụrụ ndị ọrụ rụziri ma mezie ụlọnsọ ahụ ụgwọ. 11Ha nyekwara ndị ọkpọ ǹtu na ndị na-ewu ụlọ ego iji zụta nkume a wara awa, osisi iji mee ihe njikọta na osisi ịkwado ụlọ, maka iji rụzie ụlọ a nke ndị eze Juda hapụrụ ka ọ dakasịa. 12Ndị ọrụ a rụrụ ọrụ ha nʼikwesị ntụkwasị obi. Ndị nlekọta ha bụ ndị Livayị ndị a: Jahat na Ọbadaya ndị si nʼikwu Merari, na Zekaraya na Meshulam ndịisi nʼikwu Kohat. Ndị Livayị ndị ọzọ, ndị bụ ndị nwere nghọta nʼiti ngwa egwu dị iche iche 13ka e mere ndị nlekọta ndị na-ebu ibu. Ha lekọtakwara ndị niile rụrụ ọrụ dị iche iche. Ụfọdụ nʼime ndị Livayị ndị a bụ ndị ode akwụkwọ na ndị na-edekọ ihe, na ndị na-eche ọnụ ụzọ nche. 14Mgbe ha na-ewepụta ego anabatara nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, Hilkaya onye nchụaja chọtara akwụkwọ Iwu Onyenwe anyị, bụ nke o nyere site nʼaka Mosis.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.