2 Ihe E Mere 3:9
2 Chronicles 3:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ịdị arọ ọlaedo e ji kpụọ ǹtu e ji wuo ya dị iri shekel ise. E jikwa ọlaedo techie akụkụ elu elu nke ime ọnụ ụlọ a.
2 Chronicles 3:9 in English
2 Chronicles 3:9 · Berean Standard Bible
The weight of the nails was fifty shekels of gold.* He also overlaid the upper area with gold.
Context
7Ogidi osisi silin niile, na ibo ọnụ ụzọ niile, na aja ụlọ niile, na ọnụ ụzọ niile dị nʼụlọnsọ ukwu ahụ ka o ji ọlaedo techie. Ọ gbukwara egbugbu oyiyi cherubim na mgbidi ya niile. 8O wuru Ebe ahụ Kachasị Nsọ; nke ogologo ọnụ ụlọ ya dị mita iri, otu a kwa, obosara ya dị mita iri. O ji ọlaedo dị ezi mma nke ọnụahịa ya ruru narị talenti isii techie ahụ ime ụlọ ahụ niile. 9Ịdị arọ ọlaedo e ji kpụọ ǹtu e ji wuo ya dị iri shekel ise. E jikwa ọlaedo techie akụkụ elu elu nke ime ọnụ ụlọ a. 10Solomọn tinyere oyiyi mmụọ ozi cherubim abụọ ọ kpụrụ nʼime Ebe ahụ Kachasị Nsọ, werekwa ọlaedo machie ha. 11Ịdị ogologo nku cherubim ndị a ruru mita iri. Ịdị ogologo otu nku cherub nke mbụ ruru mita abụọ na ọkara. Ọnụ nku a na-emetụ ahụ ime ụlọ nke ụlọnsọ ukwu, ma ọnụ ọnụ nku nke ọzọ, nke ịdị ogologo ya ruru mita abụọ nʼọkara, na-emetụ ọnụ otu nku cherub nke ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.