2 Ihe E Mere 29:33
2 Chronicles 29:33 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anụ ndị e doro nsọ maka ịchụ aja dị narị oke ehi isii na atụrụ na ewu dị puku atọ.
2 Chronicles 29:33 in English
2 Chronicles 29:33 · Berean Standard Bible
And the consecrated offerings were six hundred bulls and three thousand sheep.
Context
31Emesịa, Hezekaya sịrị, “Ugbu a unu edoola onwe unu nsọ nye Onyenwe anyị, bịanụ nso, webatanụ aja na onyinye ekele nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị.” Ya mere, nzukọ ahụ niile wetaara aja na onyinye ekele ha, ndị niile nwere mkpebi nʼobi ha wetara aja nsure ọkụ. 32Ọnụọgụgụ anụ ụlọ niile ha wetara bụ ndị a: iri oke ehi asaa, na narị ebule, na narị ụmụ ebule abụọ, ka e wetara maka aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị. 33Anụ ndị e doro nsọ maka ịchụ aja dị narị oke ehi isii na atụrụ na ewu dị puku atọ. 34Ma ndị nchụaja dị ole na ole, ha apụghịkwa ịgba akpụkpọ anụ niile ahụ maka aja nsure ọkụ, nʼihi ya, ụmụnne ha bụ ndị Livayị nyeere ha aka tutu ruo mgbe ozi ahụ gwụsịrị, ruokwa mgbe e doro ndị nchụaja ndị ọzọ nsọ. Nʼihi na ndị Livayị nwere obi ziri ezi karịa ndị nchụaja ido onwe ha nsọ. 35Aja nsure ọkụ bara ụba, tinyere abụba nke aja udo niile, na aja ihe ọṅụṅụ nke so aja nsure ọkụ ndị a.
Ọ bụ nʼụzọ dị otu a ka e si weghachite ije ozi na ịchụ aja nke na-adị nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.