Native Bible

2 Chronicles 29:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọnụọgụgụ anụ ụlọ niile ha wetara bụ ndị a: iri oke ehi asaa, na narị ebule, na narị ụmụ ebule abụọ, ka e wetara maka aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.

2 Chronicles 29:32 in English

2 Chronicles 29:32 · Berean Standard Bible

The number of burnt offerings the assembly brought was seventy bulls, a hundred rams, and two hundred lambs; all these were for a burnt offering to the LORD.

Context

30Eze Hezekaya na ndịisi ozi ya nyere iwu ka ndị Livayị bụọ ụfọdụ nʼime abụ ọma Devid, na nke Asaf onye amụma, maka iji ya too Onyenwe anyị. Ha mere otu a, kpọọkwa isiala nye Chineke. 31Emesịa, Hezekaya sịrị, “Ugbu a unu edoola onwe unu nsọ nye Onyenwe anyị, bịanụ nso, webatanụ aja na onyinye ekele nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị.” Ya mere, nzukọ ahụ niile wetaara aja na onyinye ekele ha, ndị niile nwere mkpebi nʼobi ha wetara aja nsure ọkụ. 32Ọnụọgụgụ anụ ụlọ niile ha wetara bụ ndị a: iri oke ehi asaa, na narị ebule, na narị ụmụ ebule abụọ, ka e wetara maka aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị. 33Anụ ndị e doro nsọ maka ịchụ aja dị narị oke ehi isii na atụrụ na ewu dị puku atọ. 34Ma ndị nchụaja dị ole na ole, ha apụghịkwa ịgba akpụkpọ anụ niile ahụ maka aja nsure ọkụ, nʼihi ya, ụmụnne ha bụ ndị Livayị nyeere ha aka tutu ruo mgbe ozi ahụ gwụsịrị, ruokwa mgbe e doro ndị nchụaja ndị ọzọ nsọ. Nʼihi na ndị Livayị nwere obi ziri ezi karịa ndị nchụaja ido onwe ha nsọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.