Native Bible

2 Chronicles 28:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼoge nsogbu ya, eze Ehaz gakwara nʼihu bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị.

2 Chronicles 28:22 in English

2 Chronicles 28:22 · Berean Standard Bible

In the time of his distress, King Ahaz became even more unfaithful to the LORD.

Context

20Mgbe Tiglat-Pilesa* eze ndị Asịrịa bịara, o wetaara Ehaz nsogbu kama enyemaka. 21Ehaz weere ụfọdụ ihe dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, na nke dị nʼụlọeze, sitekwa na nʼụlọ ndịisi obodo, were ha nye eze Asịrịa, ma ihe ndị a enyereghị ya aka. 22Nʼoge nsogbu ya, eze Ehaz gakwara nʼihu bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị. 23Ọ chụrụ aja nye chi niile nke Damaskọs, bụ ndị meriri ya nʼagha. Ọ sịrị, “Nʼihi na chi nke ndị eze Aram nyeere ha aka, ha ka m ga-achụrụ aja, ka ha nwee ike nyere m aka.” Ma ha bụ ihe wetaara ya ọdịda, bụrụkwa ọdịda nye Izrel niile. 24Ehaz chịkọtara ngwongwo niile dị nʼụlọnsọ ukwu Chineke, gbujasịa ha. O mechiri ọnụ ụzọ niile e si abanye nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ma wuo ọtụtụ ebe ịchụ aja na nkuku ụzọ niile nʼime Jerusalem.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.