Native Bible

2 Chronicles 28:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe Tiglat-Pilesa* eze ndị Asịrịa bịara, o wetaara Ehaz nsogbu kama enyemaka.

2 Chronicles 28:20 in English

2 Chronicles 28:20 · Berean Standard Bible

Then Tiglath-pileser * king of Assyria came to Ahaz but afflicted him rather than strengthening him.

Context

18Ndị Filistia na-ebusokwa ụfọdụ obodo Juda dị na mgbada ugwu, na Negeb agha. Ha meriri ma bichikwaa obodo ndị a; Bet-Shemesh, na Aijalon, na Gederọt, na Soko, na Timna, na Gimzo, na obodo nta niile gbara ha gburugburu. 19Ma Onyenwe anyị wedara Juda nʼala nʼihi Ehaz, eze Izrel onye mere ka ihe ọjọọ baa ụba na Juda, na-ekwesighị ntụkwasị obi ya nye Onyenwe anyị. 20Mgbe Tiglat-Pilesa* eze ndị Asịrịa bịara, o wetaara Ehaz nsogbu kama enyemaka. 21Ehaz weere ụfọdụ ihe dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, na nke dị nʼụlọeze, sitekwa na nʼụlọ ndịisi obodo, were ha nye eze Asịrịa, ma ihe ndị a enyereghị ya aka. 22Nʼoge nsogbu ya, eze Ehaz gakwara nʼihu bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.