2 Ihe E Mere 27:2
2 Chronicles 27:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị dịka nna ya Ụzaya mere, ma o meghị dịka nna ya, ọ banyeghị nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị. Ma ndị mmadụ gara nʼihu na-eme omume ha rụrụ arụ.
2 Chronicles 27:2 in English
2 Chronicles 27:2 · Berean Standard Bible
And he did what was right in the eyes of the LORD, just as his father Uzziah * had done. In addition, he did not enter the temple of the LORD. But the people still behaved corruptly.
Context
1Jotam gbara iri afọ abụọ na ise mgbe e mere ya eze. Ọ chịrị afọ iri na isii na Jerusalem. Nne ya bụ Jerusha nwa Zadọk. 2O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị dịka nna ya Ụzaya mere, ma o meghị dịka nna ya, ọ banyeghị nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị. Ma ndị mmadụ gara nʼihu na-eme omume ha rụrụ arụ. 3Jotam wugharịrị Ọnụ Ụzọ Ama nke dị Elu nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, rụọkwa ọtụtụ ọrụ nʼelu mgbidi nke ugwu Ofel. 4O wuru ọtụtụ obodo nʼala ugwu ugwu Juda, wuokwa ọtụtụ ebe e wusiri ike na ụlọ elu nche nʼoke ọhịa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.