Native Bible

2 Chronicles 27:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Jotam gbara iri afọ abụọ na ise mgbe e mere ya eze. Ọ chịrị afọ iri na isii na Jerusalem. Nne ya bụ Jerusha nwa Zadọk.

2 Chronicles 27:1 in English

2 Chronicles 27:1 · Berean Standard Bible

Jotham was twenty-five years old when he became king, and he reigned in Jerusalem sixteen years. His mother’s name was Jerushah * daughter of Zadok.

Context

1Jotam gbara iri afọ abụọ na ise mgbe e mere ya eze. Ọ chịrị afọ iri na isii na Jerusalem. Nne ya bụ Jerusha nwa Zadọk. 2O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị dịka nna ya Ụzaya mere, ma o meghị dịka nna ya, ọ banyeghị nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị. Ma ndị mmadụ gara nʼihu na-eme omume ha rụrụ arụ. 3Jotam wugharịrị Ọnụ Ụzọ Ama nke dị Elu nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, rụọkwa ọtụtụ ọrụ nʼelu mgbidi nke ugwu Ofel.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.