Native Bible

2 Chronicles 26:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, ndị Juda mere Ụzaya* eze nʼọnọdụ Amazaya nna ya, mgbe ọ dị naanị afọ iri na isii.

2 Chronicles 26:1 in English

2 Chronicles 26:1 · Berean Standard Bible

All the people of Judah took Uzziah,* who was sixteen years old, and made him king in place of his father Amaziah.

Context

1Mgbe ahụ, ndị Juda mere Ụzaya* eze nʼọnọdụ Amazaya nna ya, mgbe ọ dị naanị afọ iri na isii. 2Ọ bụ Ụzaya wugharịrị obodo Elat, nwetaghachi ya nye Juda mgbe eze bụ Amazaya sooro ndị nna nna ya dinaa nʼọnwụ. 3Ụzaya dị afọ iri na isii mgbe ọ malitere ịchị dịka eze. Ọ chịrị iri afọ ise na abụọ na Jerusalem.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.