2 Ihe E Mere 18:30
2 Chronicles 18:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma eze Aram enyelarị ndị ọchịagha, ndị na-agba ụgbọ agha iwu sị, “Unu ebusola onye ọbụla agha, maọbụ onye ukwu maọbụ onye nta, karịakwa naanị eze Izrel.”
2 Chronicles 18:30 in English
2 Chronicles 18:30 · Berean Standard Bible
Now the king of Aram had ordered his chariot commanders, “Do not fight with anyone, small or great, except the king of Israel.”
Context
28Ya mere, eze Izrel na Jehoshafat eze Juda pụrụ gawa Ramọt Gilead. 29Eze Izrel gwara Jehoshafat, sị, “Aga m ejikere onwe m dịka m bụ onye ọzọ banye nʼọgbọ agha, ma gị onwe gị yiri uwe eze gị.” Ya mere, eze Izrel nwogharịrị onwe ya ka onye ọzọ baa nʼọgbọ agha. 30Ma eze Aram enyelarị ndị ọchịagha, ndị na-agba ụgbọ agha iwu sị, “Unu ebusola onye ọbụla agha, maọbụ onye ukwu maọbụ onye nta, karịakwa naanị eze Izrel.” 31Mgbe ndị ọchịagha na-achị ụgbọ agha hụrụ Jehoshafat, ha chere nʼobi ha, “Onye a bụ eze Izrel.” Nʼihi ya, ha tụgharịrị ibuso ya agha, ma Jehoshafat tiri mkpu, nke mere na Onyenwe anyị nyeere ya aka. Chineke wezugara ha site nʼebe ọ nọ, 32nʼihi na mgbe ndị ọchịagha, na-achị ndị na-agba ụgbọ agha hụrụ na ọ bụghị eze Izrel, ha kwụsịrị ịchụso ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.