2 Ihe E Mere 18:19
2 Chronicles 18:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Onyenwe anyị sịrị, ‘Onye ga-aga rafuo Ehab, eze Izrel, ka ọ gaa buso Ramọt Gilead agha, gaa nwụọ nʼebe ahụ?’ “Otu onye tụpụtara aro nke a, ebe onye ọzọ tụpụtara nke ọzọ.
2 Chronicles 18:19 in English
2 Chronicles 18:19 · Berean Standard Bible
And the LORD said, ‘Who will entice Ahab king of Israel to march up and fall at Ramoth-gilead?’ And one suggested this, and another that.
Context
17Eze Izrel sịrị Jehoshafat, “Ọ bụ na m agwaghị gị na ọ dịghị mgbe ọ na-ebu amụma ihe ọma banyere m, kama naanị ihe ọjọọ?” 18Maikaya gara nʼihu sị, “Ya mere, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị: Ahụrụ m Onyenwe anyị ka ọ nọkwasịrị nʼocheeze ya, hụkwa usuu nke eluigwe ka ha na-eguzo nʼaka nri ya nakwa nʼaka ekpe ya. 19Ma Onyenwe anyị sịrị, ‘Onye ga-aga rafuo Ehab, eze Izrel, ka ọ gaa buso Ramọt Gilead agha, gaa nwụọ nʼebe ahụ?’
“Otu onye tụpụtara aro nke a, ebe onye ọzọ tụpụtara nke ọzọ. 20Nʼikpeazụ, otu mmụọ pụtara guzo nʼihu Onyenwe anyị sị, ‘Mụ onwe m ga-arafu ya.’
“Onyenwe anyị jụrụ ya sị, ‘Olee otu ị ga-esi mee nke a?’ 21“Ọ zara, ‘Aga m apụ bụrụ mmụọ nrafu nʼọnụ ndị amụma ya niile.’
“Onyenwe anyị sịrị, ‘Ị ga-enwe ike ịrafu ya. Gaa mee otu a.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.