Native Bible

2 Chronicles 18:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma Maikaya sịrị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, aga m agwa ya naanị ihe Chineke m kwuru.”

2 Chronicles 18:13 in English

2 Chronicles 18:13 · Berean Standard Bible

But Micaiah said, “As surely as the LORD lives, I will speak whatever my God tells me.”

Context

11Ndị amụma ndị ọzọ niile na-ebu otu ihe ahụ nʼamụma, na-asị, “Gaa, busoo Ramọt Gilead agha, ị ga-enwekwa mmeri, nʼihi na Onyenwe anyị ga-enyefe ya nʼaka eze.” 12Onyeozi ahụ nke gara ịkpọ Maikaya sịrị ya, “Lee, ndị amụma ndị ọzọ na-agụpụghị onye ọbụla na-ebu amụma ọganihu nye eze. Mee ka okwu gị na ha dakọta. Kwuokwa ihe ga-adị eze mma.” 13Ma Maikaya sịrị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, aga m agwa ya naanị ihe Chineke m kwuru.” 14Mgbe ọ bịarutere, eze jụrụ ya, “Maikaya, ọ bụ anyị gaa buso Ramọt Gilead agha, ka ọ bụ m hapụ?” Ọ zara, “Gaa, ma nwekwa mmeri, nʼihi na a ga-enyefe ha nʼaka gị.” 15Eze sịrị ya, “Ugboro ole ka m ga-eme ka ị ṅụọ iyi na ị gaghị agwa m ihe ọzọ, karịa naanị eziokwu nʼaha Onyenwe anyị?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.