2 Ihe E Mere 18:14
2 Chronicles 18:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ọ bịarutere, eze jụrụ ya, “Maikaya, ọ bụ anyị gaa buso Ramọt Gilead agha, ka ọ bụ m hapụ?” Ọ zara, “Gaa, ma nwekwa mmeri, nʼihi na a ga-enyefe ha nʼaka gị.”
2 Chronicles 18:14 in English
2 Chronicles 18:14 · Berean Standard Bible
When Micaiah arrived, the king asked him, “Micaiah, should we go to war against Ramoth-gilead, or should we refrain?” “Go up and triumph,” Micaiah replied, “for they will be given into your hand.”
Context
12Onyeozi ahụ nke gara ịkpọ Maikaya sịrị ya, “Lee, ndị amụma ndị ọzọ na-agụpụghị onye ọbụla na-ebu amụma ọganihu nye eze. Mee ka okwu gị na ha dakọta. Kwuokwa ihe ga-adị eze mma.” 13Ma Maikaya sịrị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, aga m agwa ya naanị ihe Chineke m kwuru.” 14Mgbe ọ bịarutere, eze jụrụ ya, “Maikaya, ọ bụ anyị gaa buso Ramọt Gilead agha, ka ọ bụ m hapụ?”
Ọ zara, “Gaa, ma nwekwa mmeri, nʼihi na a ga-enyefe ha nʼaka gị.” 15Eze sịrị ya, “Ugboro ole ka m ga-eme ka ị ṅụọ iyi na ị gaghị agwa m ihe ọzọ, karịa naanị eziokwu nʼaha Onyenwe anyị?” 16Mgbe ahụ, Mikaya zara, “Ahụrụ m Izrel niile ka ha gbasasịrị nʼelu ọtụtụ ugwu dịka atụrụ na-enweghị onye ọzụzụ atụrụ ma Onyenwe anyị sịrị, ‘Ndị a enweghị onyendu, ka onye ọbụla laghachi nʼụlọ ya nʼudo.’ ”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.