Native Bible

2 Chronicles 18:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị amụma ndị ọzọ niile na-ebu otu ihe ahụ nʼamụma, na-asị, “Gaa, busoo Ramọt Gilead agha, ị ga-enwekwa mmeri, nʼihi na Onyenwe anyị ga-enyefe ya nʼaka eze.”

2 Chronicles 18:11 in English

2 Chronicles 18:11 · Berean Standard Bible

And all the prophets were prophesying the same, saying, “Go up to Ramoth-gilead and prosper, for the LORD will deliver it into the hand of the king.”

Context

9Ehab eze Izrel na Jehoshafat eze Juda, onye ọbụla yi uwe eze ya, na-anọkwasị nʼocheeze ya nʼebe ịzọcha ọka nʼọnụ ụzọ ama e si abata obodo Sameria. Ndị amụma ahụ niile nọkwa na-ebu amụma nʼihu ha. 10Zedekaya nwa Kenaana, mere mpi igwe, ọ kwupụtara sị, “Nke a bụ ihe Onyenwe anyị na-ekwu, ‘Ihe ndị a ka ị ga-eji sọgide ndị Aram, ruo mgbe a ga-ala ha nʼiyi.’ ” 11Ndị amụma ndị ọzọ niile na-ebu otu ihe ahụ nʼamụma, na-asị, “Gaa, busoo Ramọt Gilead agha, ị ga-enwekwa mmeri, nʼihi na Onyenwe anyị ga-enyefe ya nʼaka eze.” 12Onyeozi ahụ nke gara ịkpọ Maikaya sịrị ya, “Lee, ndị amụma ndị ọzọ na-agụpụghị onye ọbụla na-ebu amụma ọganihu nye eze. Mee ka okwu gị na ha dakọta. Kwuokwa ihe ga-adị eze mma.” 13Ma Maikaya sịrị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, aga m agwa ya naanị ihe Chineke m kwuru.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.