Native Bible

2 Chronicles 16:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼoge ahụ Hanani, bụ onye ọhụ ụzọ bịakwutere Asa, bụ eze Juda sị ya, “Ebe ọ bụ na ị hapụrụ Onyenwe anyị Chineke gị, tụkwasị eze Aram obi, lee na usuu ndị agha Siria esitela nʼaka gị wezuga onwe ha.

2 Chronicles 16:7 in English

2 Chronicles 16:7 · Berean Standard Bible

At that time Hanani the seer came to King Asa of Judah and told him, “Because you have relied on the king of Aram and not on the LORD your God, the army of the king of Aram has escaped from your hand.

Context

5Mgbe Baasha nụrụ nke a, ọ kwụsịrị iwu Rema, hapụkwa ọrụ ya. 6Mgbe ahụ, eze Asa chịịrị ndị ikom niile nke Juda. Ha bịara bupusịa nkume na osisi niile dị na Rema, nke Baasha ji na-ewu ihe. O ji ihe ndị a wulie Geba na Mizpa. 7Nʼoge ahụ Hanani, bụ onye ọhụ ụzọ bịakwutere Asa, bụ eze Juda sị ya, “Ebe ọ bụ na ị hapụrụ Onyenwe anyị Chineke gị, tụkwasị eze Aram obi, lee na usuu ndị agha Siria esitela nʼaka gị wezuga onwe ha. 8Ndị Kush na ndị Libịa, ha abụghị usuu ndị agha ji ọtụtụ ụgbọ agha, na ndị na-agba ịnyịnya? Ma mgbe ị dabeere na Onyenwe anyị, o nyefere ha nʼaka gị. 9Nʼihi na anya Onyenwe anyị na-agazu ụwa niile, ịgba ha ume bụ ndị obi ha zuruoke nʼebe ọ nọ. I meela omume nzuzu na nke a, site ugbu a gaa nʼihu ị ga na-enwe agha.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.