2 Ihe E Mere 16:6
2 Chronicles 16:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, eze Asa chịịrị ndị ikom niile nke Juda. Ha bịara bupusịa nkume na osisi niile dị na Rema, nke Baasha ji na-ewu ihe. O ji ihe ndị a wulie Geba na Mizpa.
2 Chronicles 16:6 in English
2 Chronicles 16:6 · Berean Standard Bible
Then King Asa brought all the men of Judah, and they carried away the stones of Ramah and the timbers Baasha had used for building. And with these materials he built up Geba and Mizpah.
Context
4Ben-Hadad kwenyere eze Asa, zipụ ndị ọchịagha ndị agha ya ka ha gaa buso obodo Izrel niile agha. Ha lụgburu Ijon, Dan, Ebel-Maim* na obodo niile a na-achịkọbata ihe dị na Naftalị. 5Mgbe Baasha nụrụ nke a, ọ kwụsịrị iwu Rema, hapụkwa ọrụ ya. 6Mgbe ahụ, eze Asa chịịrị ndị ikom niile nke Juda. Ha bịara bupusịa nkume na osisi niile dị na Rema, nke Baasha ji na-ewu ihe. O ji ihe ndị a wulie Geba na Mizpa. 7Nʼoge ahụ Hanani, bụ onye ọhụ ụzọ bịakwutere Asa, bụ eze Juda sị ya, “Ebe ọ bụ na ị hapụrụ Onyenwe anyị Chineke gị, tụkwasị eze Aram obi, lee na usuu ndị agha Siria esitela nʼaka gị wezuga onwe ha. 8Ndị Kush na ndị Libịa, ha abụghị usuu ndị agha ji ọtụtụ ụgbọ agha, na ndị na-agba ịnyịnya? Ma mgbe ị dabeere na Onyenwe anyị, o nyefere ha nʼaka gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.