Native Bible

2 Chronicles 14:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O wezugakwara ebe niile a na-efe arụsị nʼelu ugwu, bibiekwa ebe niile a na-esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼobodo Juda. Alaeze ahụ nwekwara udo nʼokpuru ọchịchị ya.

2 Chronicles 14:5 in English

2 Chronicles 14:5 · Berean Standard Bible

He also removed the high places and incense altars from all the cities of Judah, and under him the kingdom was at peace.

Context

3Ọ wezugakwara ebe ịchụ aja nke chi ọzọ niile dị nʼugwu, tipịa ogidi nsọ niile, gbujasịakwa ogidi Ashera. 4O nyere Juda iwu ka ha chọọ Onyenwe anyị Chineke nke nna ha, ka ha debekwa iwu ya na ụkpụrụ ya niile. 5O wezugakwara ebe niile a na-efe arụsị nʼelu ugwu, bibiekwa ebe niile a na-esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼobodo Juda. Alaeze ahụ nwekwara udo nʼokpuru ọchịchị ya. 6O wuru ọtụtụ obodo e ji mgbidi gbaa gburugburu nʼala Juda niile. O nweghị onye busoro ya agha, nʼihi na Onyenwe anyị nyere ya udo. 7Nʼihi nke a, ọ gwara ndị Juda sị ha, “Ugbu a ka anyị kwesiri iwu obodo ndị a. Ka anyị wuokwa mgbidi gburugburu ha, wuokwa ụlọ elu nche, tinyesịa ha niile ibo ọnụ ụzọ ama, na mkpọrọ e ji akpọchi ya, ala a bụ nke anyị, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke onye anyị ji obi anyị chọsie ike enyela anyị udo.” Ya mere, ha wuru ihe ndị a niile nwekwa ọganihu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.