Native Bible

2 Chronicles 14:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ wezugakwara ebe ịchụ aja nke chi ọzọ niile dị nʼugwu, tipịa ogidi nsọ niile, gbujasịakwa ogidi Ashera.

2 Chronicles 14:3 in English

2 Chronicles 14:3 · Berean Standard Bible

He removed the foreign altars and high places, shattered the sacred pillars, and chopped down the Asherah poles.

Context

1Abija sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼobodo Devid. Asa, nwa ya nwoke ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. Udo dịkwa afọ iri nʼụbọchị ịbụ eze ya. 2Asa mere ihe dị mma na nke ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị bụ Chineke ya. 3Ọ wezugakwara ebe ịchụ aja nke chi ọzọ niile dị nʼugwu, tipịa ogidi nsọ niile, gbujasịakwa ogidi Ashera. 4O nyere Juda iwu ka ha chọọ Onyenwe anyị Chineke nke nna ha, ka ha debekwa iwu ya na ụkpụrụ ya niile. 5O wezugakwara ebe niile a na-efe arụsị nʼelu ugwu, bibiekwa ebe niile a na-esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼobodo Juda. Alaeze ahụ nwekwara udo nʼokpuru ọchịchị ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.