2 Ihe E Mere 13:17
2 Chronicles 13:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Abija na ndị agha ya gburu narị puku ndị Izrel ise nʼụbọchị ahụ.
2 Chronicles 13:17 in English
2 Chronicles 13:17 · Berean Standard Bible
Then Abijah and his people struck them with a mighty blow, and 500,000 chosen men of Israel fell slain.
Context
15Ndị Juda tiri oke mkpu agha. Mgbe ha na-eti mkpu a, Chineke mere ka Abija na ndị Juda merie Jeroboam na ndị Izrel. 16Ndị agha Izrel gbara ọsọ nʼihu ndị Juda, Chineke nyefere ha nʼaka ndị Juda. 17Abija na ndị agha ya gburu narị puku ndị Izrel ise nʼụbọchị ahụ. 18Ya mere, ntụkwasị obi nke Juda nwere nʼime Onyenwe anyị Chineke nna ha mere ka ha merie Jeroboam na ndị Izrel. 19Abija chụkwara Jeroboam na ndị agha ya ọsọ dọta obodo ndị a nʼagha: Betel, na Jeshana, na Efrọn, na obodo niile gbara ha gburugburu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.