2 Ihe E Mere 10:3
2 Chronicles 10:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, ha ziri ozi kpọọ Jeroboam, ya na ndị Izrel niile jekwuru Rehoboam sị ya:
2 Chronicles 10:3 in English
2 Chronicles 10:3 · Berean Standard Bible
So they sent for Jeroboam, and he and all Israel came to Rehoboam and said,
Context
1Rehoboam gara Shekem nʼihi na Izrel niile zukọrọ ebe ahụ ime ya eze. 2Mgbe Jeroboam nwa Nebat nụrụ nke a (ọ nọ nʼIjipt ebe ọ gbagara ọsọ ndụ site nʼaka eze Solomọn) o sitere Ijipt lọta. 3Ya mere, ha ziri ozi kpọọ Jeroboam, ya na ndị Izrel niile jekwuru Rehoboam sị ya: 4“Nna gị boro anyị ibu arọ, ma ugbu a mee ka ibu arọ na ịyagba arọ a nke o bokwasịrị anyị dị mfe, anyị ga-ejere gị ozi.” 5Rehoboam zara ha sị, “Bịaghachikwutenụ m mgbe ụbọchị atọ gasịrị.” Nʼihi ya ndị ahụ lara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.