2 Ihe E Mere 10:2
2 Chronicles 10:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe Jeroboam nwa Nebat nụrụ nke a (ọ nọ nʼIjipt ebe ọ gbagara ọsọ ndụ site nʼaka eze Solomọn) o sitere Ijipt lọta.
2 Chronicles 10:2 in English
2 Chronicles 10:2 · Berean Standard Bible
When Jeroboam son of Nebat heard about this, he returned from Egypt, where he had fled from King Solomon.
Context
1Rehoboam gara Shekem nʼihi na Izrel niile zukọrọ ebe ahụ ime ya eze. 2Mgbe Jeroboam nwa Nebat nụrụ nke a (ọ nọ nʼIjipt ebe ọ gbagara ọsọ ndụ site nʼaka eze Solomọn) o sitere Ijipt lọta. 3Ya mere, ha ziri ozi kpọọ Jeroboam, ya na ndị Izrel niile jekwuru Rehoboam sị ya: 4“Nna gị boro anyị ibu arọ, ma ugbu a mee ka ibu arọ na ịyagba arọ a nke o bokwasịrị anyị dị mfe, anyị ga-ejere gị ozi.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.