1 Timoti 5:11
1 Timothy 5:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma o kwesighị ka e debanye aha ụmụ agbọghọ di ha nwụrụ nʼotu ụmụ nwanyị di ha nwụrụ anwụ. Nʼihi na mgbe ọchịchọ anụ ahụ jidesiri ha ike, ha ga-enupuru Kraịst isi, chọwa ịlụ di ọzọ.
1 Timothy 5:11 in English
1 Timothy 5:11 · Berean Standard Bible
But refuse to enroll younger widows. For when their passions draw them away from Christ, they will want to marry,
Context
9Nwanyị ọbụla di ya nwụrụ ga-aba nʼotu ndị di ha nwụrụ ga-abụ onye gbara iri afọ isii maọbụ karịa. Ọ ga-abụkwa onye lụrụ naanị otu di. 10Ọ ga-abụ onye mmadụ niile na-agbara ezi ama, nʼihi ezi ọrụ ọ rụrụ. Ọ ga-abụ onye zụlitere ụmụ ya nʼụzọ ziri ezi, onye na-elezi ndị ọbịa anya, onye na-enyere ndị ọrịa na ndị merụrụ ahụ aka, onye na-asa ụkwụ ndị nsọ na onye jikeere mgbe niile ime ihe ọma. 11Ma o kwesighị ka e debanye aha ụmụ agbọghọ di ha nwụrụ nʼotu ụmụ nwanyị di ha nwụrụ anwụ. Nʼihi na mgbe ọchịchọ anụ ahụ jidesiri ha ike, ha ga-enupuru Kraịst isi, chọwa ịlụ di ọzọ. 12Ụdị omume a ga-ewetara ha ikpe ọmụma, nʼihi na ha emezughị nkwa ha kwere na mbụ. 13Wezugakwarị nke a, na ha amụta omume ịdị umengwụ, nʼaga nʼụlọ dị iche iche. Ọ bụghị naanị na ha bụ ndị na-adịghị arụ ọrụ, kama ha na-etinye anya nʼihe na-agbasaghị ha, na-akpa asịrị, na-ekwu okwu nzuzu, na-ekwu ihe ha ekwesighị ikwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.