1 Timoti 5:13
1 Timothy 5:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Wezugakwarị nke a, na ha amụta omume ịdị umengwụ, nʼaga nʼụlọ dị iche iche. Ọ bụghị naanị na ha bụ ndị na-adịghị arụ ọrụ, kama ha na-etinye anya nʼihe na-agbasaghị ha, na-akpa asịrị, na-ekwu okwu nzuzu, na-ekwu ihe ha ekwesighị ikwu.
1 Timothy 5:13 in English
1 Timothy 5:13 · Berean Standard Bible
At the same time they will also learn to be idle, going from house to house and being not only idle, but also gossips and busybodies, discussing things they should not mention.
Context
11Ma o kwesighị ka e debanye aha ụmụ agbọghọ di ha nwụrụ nʼotu ụmụ nwanyị di ha nwụrụ anwụ. Nʼihi na mgbe ọchịchọ anụ ahụ jidesiri ha ike, ha ga-enupuru Kraịst isi, chọwa ịlụ di ọzọ. 12Ụdị omume a ga-ewetara ha ikpe ọmụma, nʼihi na ha emezughị nkwa ha kwere na mbụ. 13Wezugakwarị nke a, na ha amụta omume ịdị umengwụ, nʼaga nʼụlọ dị iche iche. Ọ bụghị naanị na ha bụ ndị na-adịghị arụ ọrụ, kama ha na-etinye anya nʼihe na-agbasaghị ha, na-akpa asịrị, na-ekwu okwu nzuzu, na-ekwu ihe ha ekwesighị ikwu. 14Nʼihi nke a, ana m adụ ndị ụmụ agbọghọ ndị a di ha nwụrụ ọdụ ka ha lụrụ di ọzọ, mụọkwa ụmụ, ma na-elekọtazikwa ezinaụlọ ha anya nke ọma. Ọ bụrụ na ha mee nke a, ọ dịghị onye iro ọbụla ga-ekwu okwu ọjọọ megide anyị. 15Ụfọdụ ndị mmadụ adahielarị ụzọ, soro ekwensu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.