Native Bible

1 Timothy 5:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ ga-abụ onye mmadụ niile na-agbara ezi ama, nʼihi ezi ọrụ ọ rụrụ. Ọ ga-abụ onye zụlitere ụmụ ya nʼụzọ ziri ezi, onye na-elezi ndị ọbịa anya, onye na-enyere ndị ọrịa na ndị merụrụ ahụ aka, onye na-asa ụkwụ ndị nsọ na onye jikeere mgbe niile ime ihe ọma.

1 Timothy 5:10 in English

1 Timothy 5:10 · Berean Standard Bible

and well known for good deeds such as bringing up children, entertaining strangers, washing the feet of the saints, imparting relief to the afflicted, and devoting herself to every good work.

Context

8Onye ọbụla na-adịghị egboro ndị ikwu ya, karịchasịa ndị ezinaụlọ nke aka ya ihe na-akpa ha mkpa, ajụla okwukwe ahụ ma jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe na njọ. 9Nwanyị ọbụla di ya nwụrụ ga-aba nʼotu ndị di ha nwụrụ ga-abụ onye gbara iri afọ isii maọbụ karịa. Ọ ga-abụkwa onye lụrụ naanị otu di. 10Ọ ga-abụ onye mmadụ niile na-agbara ezi ama, nʼihi ezi ọrụ ọ rụrụ. Ọ ga-abụ onye zụlitere ụmụ ya nʼụzọ ziri ezi, onye na-elezi ndị ọbịa anya, onye na-enyere ndị ọrịa na ndị merụrụ ahụ aka, onye na-asa ụkwụ ndị nsọ na onye jikeere mgbe niile ime ihe ọma. 11Ma o kwesighị ka e debanye aha ụmụ agbọghọ di ha nwụrụ nʼotu ụmụ nwanyị di ha nwụrụ anwụ. Nʼihi na mgbe ọchịchọ anụ ahụ jidesiri ha ike, ha ga-enupuru Kraịst isi, chọwa ịlụ di ọzọ. 12Ụdị omume a ga-ewetara ha ikpe ọmụma, nʼihi na ha emezughị nkwa ha kwere na mbụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.