1 Timoti 4:9
1 Timothy 4:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Okwu a kwesiri ntụkwasị obi, kwesikwa ka a nara ya nke ọma.
1 Timothy 4:9 in English
1 Timothy 4:9 · Berean Standard Bible
This is a trustworthy saying, worthy of full acceptance.
Context
7Atụfula oge gị nʼịrụ ụka rụrụ arụ banyere akụkọ ifo nzuzu, na akụkọ na-abaghị uru nke ndị agadi nwanyị na-akọ. Kama zụọ onwe gị ka ị bụrụ onye nke na-asọpụrụ Chineke. 8Igwuri egwu nke anụ ahụ dị mma kama ịbụ onye nke Chineke bara uru karịa nʼụzọ ọbụla, nʼihi na nkwa dị nʼime ya bụ banyere ndụ dị ugbu a na ndụ dị nʼihu. 9Okwu a kwesiri ntụkwasị obi, kwesikwa ka a nara ya nke ọma. 10Anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ na-ahụjukwa anya maka na anyị tụkwasịrị olileanya anyị na Chineke dị ndụ, onye bụ Onye nzọpụta mmadụ niile, karịchasịa, nke ndị niile kwere ekwe. 11Ndị a bụ ihe ndị ị ga-akụzi, kwudosie ike na-akụzi ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.