1 Samuel 7:15
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Samuel nọgidere dịka onye ikpe ndị Izrel ụbọchị niile nke ndụ ya.
1 Samuel 7:15 in English
1 Samuel 7:15 · Berean Standard Bible
So Samuel judged Israel all the days of his life.
Context
13Ya mere, mmeri a e meriri ndị Filistia mere ka ha ghara ibuso Izrel agha ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị kwụsịrị ha ime nke a ụbọchị niile nke ndụ Samuel. 14E nyeghachiri ndị Izrel obodo niile ndị Filistia dọtara nʼagha na mbụ, nke dị site nʼEkrọn ruo Gat. Ndị Izrel napụtara oke ala ndị a site nʼaka ndị Filistia. Nʼụzọ dị otu a, e mere ka udo dị nʼetiti ndị Izrel na ndị Amọrait.* 15Samuel nọgidere dịka onye ikpe ndị Izrel ụbọchị niile nke ndụ ya. 16Afọ niile, ọ na-ejegharị site nʼotu obodo ruo nʼobodo ọzọ, site nʼobodo Betel ruo Gilgal, ruokwa Mizpa.* Ọ na-anọkwa nʼobodo ndị a na-ekpe ndị Izrel ikpe. 17Ma ọ na-alọghachi na Rema, nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka ụlọ ya dị. O kpekwara ndị Izrel ikpe nʼebe ahụ, wuokwara Onyenwe anyị ebe ịchụ aja nʼebe ahụ.
7:1 Igbe ọgbụgba ndụ ahụ dịgidere nʼebe a, ruo oge Devid bịara bulata ya na Jerusalem. 1Sa 6:21; Abụ 132:6; 2Sa 6:2-3
7:2 Eleghị anya nʼihi na Onyenwe anyị chepuru ihu ya site nʼebe ha nọ.
7:14 Ndị Amọrị bụ aha ọzọ eji mara ndị niile bụ ndị Kenan. Jen 14:5-7
7:16 Betel, Gilgal na Mizpa bụ obodo atọ ndị so nʼoke ala Benjamin ketara. Ọ bụkwa na mpaghara ala ndị a, ka ụlọnsọ Chineke dị. Jos 18:11-28; Jos 4:19
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.