1 Samuel 7:14
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
E nyeghachiri ndị Izrel obodo niile ndị Filistia dọtara nʼagha na mbụ, nke dị site nʼEkrọn ruo Gat. Ndị Izrel napụtara oke ala ndị a site nʼaka ndị Filistia. Nʼụzọ dị otu a, e mere ka udo dị nʼetiti ndị Izrel na ndị Amọrait.*
1 Samuel 7:14 in English
1 Samuel 7:14 · Berean Standard Bible
The cities from Ekron to Gath, which the Philistines had taken, were restored to Israel, who also delivered the surrounding territory from the hand of the Philistines. And there was peace between the Israelites and the Amorites.
Context
12Mgbe ahụ, Samuel weere otu nkume doo ya nʼagbata Mizpa na Shen, kpọọ ebe ahụ, Ebeneza, nke pụtara, “Nkume inyeaka,” nʼihi na ọ sịrị, “Nʼezie, Onyenwe anyị enyerela anyị aka ruo ugbu a.” 13Ya mere, mmeri a e meriri ndị Filistia mere ka ha ghara ibuso Izrel agha ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị kwụsịrị ha ime nke a ụbọchị niile nke ndụ Samuel. 14E nyeghachiri ndị Izrel obodo niile ndị Filistia dọtara nʼagha na mbụ, nke dị site nʼEkrọn ruo Gat. Ndị Izrel napụtara oke ala ndị a site nʼaka ndị Filistia. Nʼụzọ dị otu a, e mere ka udo dị nʼetiti ndị Izrel na ndị Amọrait.* 15Samuel nọgidere dịka onye ikpe ndị Izrel ụbọchị niile nke ndụ ya. 16Afọ niile, ọ na-ejegharị site nʼotu obodo ruo nʼobodo ọzọ, site nʼobodo Betel ruo Gilgal, ruokwa Mizpa.* Ọ na-anọkwa nʼobodo ndị a na-ekpe ndị Izrel ikpe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.