Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha butere igbe ọgbụgba ndụ Chineke, buba ya nʼime ụlọ Dagọn,* dọba ya nʼakụkụ Dagọn.

1 Samuel 5:2 in English

1 Samuel 5:2 · Berean Standard Bible

carried it into the temple of Dagon, and set it beside his statue.*

Context

1Mgbe ndị Filistia buuru igbe ọgbụgba ndụ Chineke, ha si Ebeneza buru ya buga Ashdọd. 2Ha butere igbe ọgbụgba ndụ Chineke, buba ya nʼime ụlọ Dagọn,* dọba ya nʼakụkụ Dagọn. 3Mgbe ndị Ashdọd tetara nʼisi ụtụtụ echi ya, ma lee, Dagọn adaala, kpuo ihu ya nʼala nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị. Ha bulikwara Dagọn elu doghachi ya nʼọnọdụ ya. 4Ma nʼụtụtụ echi ya, Dagọn adakwala kpuo ihu nʼala nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị. Isi ya na aka ya abụọ dakapụrụ, tọgbọrọ na mbata ọnụ ụzọ, Ọ bụkwa naanị ogwe ahụ ya fọdụrụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.