Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma mgbe ọ na-anwụ, ndị inyom na-eji ya ime, sịrị ya, “Atụla egwu, adala mba, ị mụọla nwa nwoke.” Ma ọ zaghị ha ihe ọbụla. Ọ ṅakwaghị ha ntị.

1 Samuel 4:20 in English

1 Samuel 4:20 · Berean Standard Bible

As she was dying, the women attending to her said, “Do not be afraid, for you have given birth to a son!” But she did not respond or pay any heed.

Context

18Mgbe onyeozi ahụ kwutere maka igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Elayị sitere nʼoche ya dalaa azụ nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama, dajie olu ya, nwụọ! Nʼihi na o meela nnọọ agadi. Ọ bụkwa onye buru ibu. Ya onwe ya kpekwara* ụmụ Izrel ikpe iri afọ anọ. 19Nwunye nwa ya, bụ nwunye Finehaz, dị ime, nọọkwa nso oge ịmụ nwa ya. Mgbe ọ nụrụ maka obubu e buuru igbe ọgbụgba ndụ Chineke, nụkwa maka ọnwụ nna di ya na di ya, ọ mụpụtara nwa ya nʼike. Ma ọ nwụrụ nʼihi ihe mgbu nke afọ ime. 20Ma mgbe ọ na-anwụ, ndị inyom na-eji ya ime, sịrị ya, “Atụla egwu, adala mba, ị mụọla nwa nwoke.” Ma ọ zaghị ha ihe ọbụla. Ọ ṅakwaghị ha ntị. 21Ọ gụrụ nwantakịrị aha, kpọọ ya Ịkabọdụ, kwuo sị, “Ebube esitela nʼIzrel pụọ,” nʼihi obubu e buuru igbe ọgbụgba ndụ Chineke, na nʼihi ọnwụ nna di ya na di ya. 22O kwuru sị, “Ebube esitela nʼIzrel pụọ, nʼihi na e buuru igbe Chineke.” 4:8 Nʼihi na ndị Filistia e kwenyeghị na Chineke, kama ha kweere na chi arụsị. 4:18 Maọbụ, Duru ụmụ Izrel

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.