Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Sọl gwara onye na-ebu ngwa agha ya, sị, “Mịpụta mma agha gị, were ya magbuo m ka ndị a a na-ebighị ugwu ghara ịbịa jiri m mee ihe egwuregwu.” Ma onye na-ebu ngwa agha ya ekweghị, nʼihi ọnọdụ oke egwu. Nʼihi ya, Sọl were mma agha nke ya, dakwasị nʼelu ya.

1 Samuel 31:4 in English

1 Samuel 31:4 · Berean Standard Bible

Then Saul said to his armor-bearer, “Draw your sword and run it through me, or these uncircumcised men will come and run me through and torture me!” But his armor-bearer was terrified and refused to do it. So Saul took his own sword and fell on it.

Context

2Ndị Filistia ji ike chụso Sọl na ụmụ ya. Ha gburu ụmụ ya ndị ikom, Jonatan, Abinadab na Malkishua. 3Agha ahụ siri ike nke ukwuu megide Sọl, mgbe ndị na-agba ụta chụkwutere ya ha merụrụ ya ahụ nʼebe ọ dị ukwuu. 4Sọl gwara onye na-ebu ngwa agha ya, sị, “Mịpụta mma agha gị, were ya magbuo m ka ndị a a na-ebighị ugwu ghara ịbịa jiri m mee ihe egwuregwu.” Ma onye na-ebu ngwa agha ya ekweghị, nʼihi ọnọdụ oke egwu. Nʼihi ya, Sọl were mma agha nke ya, dakwasị nʼelu ya. 5Mgbe onye na-ebu ihe agha Sọl hụrụ na ọ nwụọla, ya onwe ya dakwasịkwara nʼelu mma agha nke ya, soro Sọl nwụọ. 6Ya mere, Sọl na ụmụ ya ndị ikom atọ, onye na-ebu ihe agha ya na ndị agha ya niile, nwụrụ nʼotu ụbọchị ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.