1 Samuel 31:5
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe onye na-ebu ihe agha Sọl hụrụ na ọ nwụọla, ya onwe ya dakwasịkwara nʼelu mma agha nke ya, soro Sọl nwụọ.
1 Samuel 31:5 in English
1 Samuel 31:5 · Berean Standard Bible
When his armor-bearer saw that Saul was dead, he too fell on his own sword and died with him.
Context
3Agha ahụ siri ike nke ukwuu megide Sọl, mgbe ndị na-agba ụta chụkwutere ya ha merụrụ ya ahụ nʼebe ọ dị ukwuu. 4Sọl gwara onye na-ebu ngwa agha ya, sị, “Mịpụta mma agha gị, were ya magbuo m ka ndị a a na-ebighị ugwu ghara ịbịa jiri m mee ihe egwuregwu.”
Ma onye na-ebu ngwa agha ya ekweghị, nʼihi ọnọdụ oke egwu. Nʼihi ya, Sọl were mma agha nke ya, dakwasị nʼelu ya. 5Mgbe onye na-ebu ihe agha Sọl hụrụ na ọ nwụọla, ya onwe ya dakwasịkwara nʼelu mma agha nke ya, soro Sọl nwụọ. 6Ya mere, Sọl na ụmụ ya ndị ikom atọ, onye na-ebu ihe agha ya na ndị agha ya niile, nwụrụ nʼotu ụbọchị ahụ. 7Mgbe ndị Izrel nọ nʼofe ọzọ nke ndagwurugwu, na ndị nọ nʼofe Jọdan, hụrụ na ndị agha Izrel agbaala ọsọ, na Sọl na ụmụ ya ndị ikom anwụọla, ha hapụrụ obodo ha niile gbapụ ọsọ. Ndị Filistia bịakwara bichie nʼime ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.