1 Samuel 30:20
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọzọkwa, Devid chịkọtara igwe ehi na igwe ewu na atụrụ. Ndị ikom ya chịịrị ha, tinyere anụ ụlọ ndị ọzọ, na-aga, na-asị, “Ndị a bụ ihe Devid kwatara nʼagha.”
1 Samuel 30:20 in English
1 Samuel 30:20 · Berean Standard Bible
And he recovered all the flocks and herds, which his men drove ahead of the other livestock, calling out, “This is David’s plunder!”
Context
18Devid nwetaghachiri ihe niile ndị Amalek kwatara nʼagha, tinyere ndị inyom ya abụọ. 19O nweghị ihe furu efu, ma nke ukwu ma nke nta, ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom, ihe a kwatara nʼagha, maọbụ ihe ọbụla ọzọ ndị Amalek dọtara nʼagha. Devid nwetaghachiri ihe niile. 20Ọzọkwa, Devid chịkọtara igwe ehi na igwe ewu na atụrụ. Ndị ikom ya chịịrị ha, tinyere anụ ụlọ ndị ọzọ, na-aga, na-asị, “Ndị a bụ ihe Devid kwatara nʼagha.” 21Emesịa, Devid bịarutere ebe narị ndị ikom abụọ ndị ahụ nọ na Ndagwurugwu Beso. Ndị a bụ ndị ahụ na-enweghị ike iso Devid nʼihi na ike gwụrụ ha. Ha pụtara zute Devid na ndị so ya. Mgbe Devid na ndị ikom ya bịara ha nso, ọ jụrụ ha otu ha mere. 22Ma ndị ikom ọjọọ ahụ niile, na ndị okwu na ụka nọ nʼetiti ndị na-eso Devid sịrị, “Nʼihi na ndị a esoghị anyị jee, ya mere ha agaghị eso anyị keta ihe ndị a anyị kwatara nʼagha. Nyeghachi ha naanị nwunye ha na ụmụ ha; gwakwa ha ka ha laa.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.