1 Samuel 30:21
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Emesịa, Devid bịarutere ebe narị ndị ikom abụọ ndị ahụ nọ na Ndagwurugwu Beso. Ndị a bụ ndị ahụ na-enweghị ike iso Devid nʼihi na ike gwụrụ ha. Ha pụtara zute Devid na ndị so ya. Mgbe Devid na ndị ikom ya bịara ha nso, ọ jụrụ ha otu ha mere.
1 Samuel 30:21 in English
1 Samuel 30:21 · Berean Standard Bible
When David came to the two hundred men who had been too exhausted to follow him from the Brook of Besor, they came out to meet him and the troops with him. As David approached the men, he greeted them,
Context
19O nweghị ihe furu efu, ma nke ukwu ma nke nta, ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom, ihe a kwatara nʼagha, maọbụ ihe ọbụla ọzọ ndị Amalek dọtara nʼagha. Devid nwetaghachiri ihe niile. 20Ọzọkwa, Devid chịkọtara igwe ehi na igwe ewu na atụrụ. Ndị ikom ya chịịrị ha, tinyere anụ ụlọ ndị ọzọ, na-aga, na-asị, “Ndị a bụ ihe Devid kwatara nʼagha.” 21Emesịa, Devid bịarutere ebe narị ndị ikom abụọ ndị ahụ nọ na Ndagwurugwu Beso. Ndị a bụ ndị ahụ na-enweghị ike iso Devid nʼihi na ike gwụrụ ha. Ha pụtara zute Devid na ndị so ya. Mgbe Devid na ndị ikom ya bịara ha nso, ọ jụrụ ha otu ha mere. 22Ma ndị ikom ọjọọ ahụ niile, na ndị okwu na ụka nọ nʼetiti ndị na-eso Devid sịrị, “Nʼihi na ndị a esoghị anyị jee, ya mere ha agaghị eso anyị keta ihe ndị a anyị kwatara nʼagha. Nyeghachi ha naanị nwunye ha na ụmụ ha; gwakwa ha ka ha laa.” 23Ma Devid sịrị, “Mba, ụmụnna m, unu ekwesighị isi otu a kee ihe ndị ahụ Onyenwe anyị nyere anyị. O chebere anyị, nyefee nʼaka anyị ndị agha ahụ niile bịara imegide anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.