Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na agwara m ya na m ga-ekpe ezinaụlọ ya ikpe, ruo mgbe ebighị ebi, nʼihi mmehie ahụ ọ maara ihe banyere ya. Nʼihi na ụmụ ya mere onwe ha ndị a na-elelị anya,* ma o meghị ihe ọbụla ịkwụsị ha.

1 Samuel 3:13 in English

1 Samuel 3:13 · Berean Standard Bible

I told him that I would judge his house forever for the iniquity of which he knows, because his sons blasphemed God * and he did not restrain them.

Context

11Onyenwe anyị gwara Samuel sị, “Lee, ana m aga ime ihe nʼIzrel nke ga-eme ka ntị nụrụ ya zụọ wuruwuru. 12Nʼoge ahụ aga m emezu ihe niile m kwuru megide Elayị na ezinaụlọ ya, site na mmalite ruo ọgwụgwụ. 13Nʼihi na agwara m ya na m ga-ekpe ezinaụlọ ya ikpe, ruo mgbe ebighị ebi, nʼihi mmehie ahụ ọ maara ihe banyere ya. Nʼihi na ụmụ ya mere onwe ha ndị a na-elelị anya,* ma o meghị ihe ọbụla ịkwụsị ha. 14Ya mere, aṅụọla m iyi nye ụlọ Elayị sị, ‘Ikpe ọmụma dịkwasịrị ụlọ Elayị bụ nke a na-agaghị eji onyinye maọbụ ịchụ aja kpuchie.’ ” 15Samuel dinara ala tutu ruo ụtụtụ. Mgbe chi bọrọ, o meghere ọnụ ụzọ ụlọ nzute Onyenwe anyị dịka ọ na-eme. Ma egwu tụrụ ya ịgwa Elayị ọhụ ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.