1 Samuel 3:12
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼoge ahụ aga m emezu ihe niile m kwuru megide Elayị na ezinaụlọ ya, site na mmalite ruo ọgwụgwụ.
1 Samuel 3:12 in English
1 Samuel 3:12 · Berean Standard Bible
On that day I will carry out against Eli everything I have spoken about his family, from beginning to end.
Context
10Onyenwe anyị bịara guzo onwe ya nʼebe ahụ, kpọọ ya ọzọ dịka o si kpọọ ya na mbụ sị, “Samuel! Samuel!”
Samuel zara sị, “Lee m, kwuo, nʼihi na ohu gị na-anụ.” 11Onyenwe anyị gwara Samuel sị, “Lee, ana m aga ime ihe nʼIzrel nke ga-eme ka ntị nụrụ ya zụọ wuruwuru. 12Nʼoge ahụ aga m emezu ihe niile m kwuru megide Elayị na ezinaụlọ ya, site na mmalite ruo ọgwụgwụ. 13Nʼihi na agwara m ya na m ga-ekpe ezinaụlọ ya ikpe, ruo mgbe ebighị ebi, nʼihi mmehie ahụ ọ maara ihe banyere ya. Nʼihi na ụmụ ya mere onwe ha ndị a na-elelị anya,* ma o meghị ihe ọbụla ịkwụsị ha. 14Ya mere, aṅụọla m iyi nye ụlọ Elayị sị, ‘Ikpe ọmụma dịkwasịrị ụlọ Elayị bụ nke a na-agaghị eji onyinye maọbụ ịchụ aja kpuchie.’ ”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.