Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ọbụla Devid wakporo akụkụ ọbụla, ọ dịghị ahapụ nwoke maọbụ nwanyị ndụ. Ma ọ na-akpụrụ atụrụ ha, na ehi ha, na ịnyịnya ibu ha, na ịnyịnya kamel ha, nakwa uwe ha. Emesịa, ọ na-alọghachikwuru Akish.

1 Samuel 27:9 in English

1 Samuel 27:9 · Berean Standard Bible

Whenever David attacked a territory, he did not leave a man or woman alive, but he took the flocks and herds, the donkeys, camels, and clothing. Then he would return to Achish,

Context

7Devid biri nʼoke ala ndị Filistia otu afọ na ọnwa anọ. 8Devid na ndị ikom ya nọgidere oge ahụ niile na-emegide ndị Geshua, ndị Gizi na ndị Amalek. (Site na mgbe ochie ndị a bi nʼala ahụ gbatịrị ruo Shua na Ijipt) 9Mgbe ọbụla Devid wakporo akụkụ ọbụla, ọ dịghị ahapụ nwoke maọbụ nwanyị ndụ. Ma ọ na-akpụrụ atụrụ ha, na ehi ha, na ịnyịnya ibu ha, na ịnyịnya kamel ha, nakwa uwe ha. Emesịa, ọ na-alọghachikwuru Akish. 10Ọ bụrụ na Akish ajụọ Devid ajụjụ sị, “Ndị ole ka unu busoro agha taa?” Devid ga-aza sị, “Ọ bụ ndị bi na ndịda Juda”, maọbụ “ndị ndịda Jerahmel”, maọbụ “ndị ndịda Ken.”* 11Ma ọ dịghị nwoke maọbụ nwanyị onye ọ hapụrụ ndụ, nke a ga-akpọta na Gat, nʼihi na o chere nʼobi ya sị, “Ha nwere ike ịbịa kwuo megide anyị, sị, ‘Otu a ka Devid mere.’ ” Otu a ka ọ na-emekwa ọtụtụ oge ahụ niile o bi nʼetiti ndị Filistia.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.