1 Samuel 27:7
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Devid biri nʼoke ala ndị Filistia otu afọ na ọnwa anọ.
1 Samuel 27:7 in English
1 Samuel 27:7 · Berean Standard Bible
And the time that David lived in Philistine territory amounted to a year and four months.
Context
5Devid gwara Akish sị ya, “Ọ bụrụ na m anatala amara nʼebe ị nọ, ọ ga-adị mma ka enye m otu obodo nʼime obodo nke ala a, ka m biri. Nʼihi gịnị ka ohu gị ga-eji soro gị biri nʼobodo eze?” 6Akish nyere ya Ziklag, nʼihi ya, Ziklag bụ obodo ndị eze Juda ruo taa. 7Devid biri nʼoke ala ndị Filistia otu afọ na ọnwa anọ. 8Devid na ndị ikom ya nọgidere oge ahụ niile na-emegide ndị Geshua, ndị Gizi na ndị Amalek. (Site na mgbe ochie ndị a bi nʼala ahụ gbatịrị ruo Shua na Ijipt) 9Mgbe ọbụla Devid wakporo akụkụ ọbụla, ọ dịghị ahapụ nwoke maọbụ nwanyị ndụ. Ma ọ na-akpụrụ atụrụ ha, na ehi ha, na ịnyịnya ibu ha, na ịnyịnya kamel ha, nakwa uwe ha. Emesịa, ọ na-alọghachikwuru Akish.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.