1 Samuel 27:10
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na Akish ajụọ Devid ajụjụ sị, “Ndị ole ka unu busoro agha taa?” Devid ga-aza sị, “Ọ bụ ndị bi na ndịda Juda”, maọbụ “ndị ndịda Jerahmel”, maọbụ “ndị ndịda Ken.”*
1 Samuel 27:10 in English
1 Samuel 27:10 · Berean Standard Bible
who would ask him, “What have you raided today?” And David would reply, “The Negev of Judah,” or “The Negev of Jerahmeel,” or “The Negev of the Kenites.”
Context
8Devid na ndị ikom ya nọgidere oge ahụ niile na-emegide ndị Geshua, ndị Gizi na ndị Amalek. (Site na mgbe ochie ndị a bi nʼala ahụ gbatịrị ruo Shua na Ijipt) 9Mgbe ọbụla Devid wakporo akụkụ ọbụla, ọ dịghị ahapụ nwoke maọbụ nwanyị ndụ. Ma ọ na-akpụrụ atụrụ ha, na ehi ha, na ịnyịnya ibu ha, na ịnyịnya kamel ha, nakwa uwe ha. Emesịa, ọ na-alọghachikwuru Akish. 10Ọ bụrụ na Akish ajụọ Devid ajụjụ sị, “Ndị ole ka unu busoro agha taa?” Devid ga-aza sị, “Ọ bụ ndị bi na ndịda Juda”, maọbụ “ndị ndịda Jerahmel”, maọbụ “ndị ndịda Ken.”* 11Ma ọ dịghị nwoke maọbụ nwanyị onye ọ hapụrụ ndụ, nke a ga-akpọta na Gat, nʼihi na o chere nʼobi ya sị, “Ha nwere ike ịbịa kwuo megide anyị, sị, ‘Otu a ka Devid mere.’ ” Otu a ka ọ na-emekwa ọtụtụ oge ahụ niile o bi nʼetiti ndị Filistia. 12Akish kwenyere Devid, kwuo nʼobi ya sị, “Devid abụrụla ihe a kpọrọ asị nʼebe ndị nke ya bụ ndị Izrel nọ. Ọ ga-abụkwara m ohu ruo mgbe niile.”
27:10 Ndị Jerahmel bụ ụmụ ụmụ Juda site na nwa nwa ya bụ Hezrọn, 1Ih 2:5,9,25 gụọ ihe banyere ndị Ken nʼihe e depụtara nʼakwụkwọ. Nkp 4:11
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.